24 N'ihi na onye ọ bula nke nāchọ izọpuita ndu-ya, ọ gētufu ya; ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya n'ihim, onye ahu gāzọputa ya.
25 N'ihi na ùrù gini ka ọ nābara madu, ma ọ buru na o rita uwa dum n'urù, o we tufue ma-ọbu anapu ya onwe-ya?
26 N'ihi na onye ọ bula ihere Mu onwem na okwum nile gēme, ihere onye ahu gēme Nwa nke madu, mb͕e Ọ gābia n'ebube nke aka Ya, na ebube nke Nna-Ya, na ebube nke ndi-mọ-ozi-Ya di nsọ.
27 Ma asim unu n'ezie, Ufọdu di n'etiti ndi guzoro n'ebe a, ndi nāgaghi-edetu ọnwu ire ma-ọli, rue mb͕e ha gāhu ala-eze Chineke.
28 O we rue mb͕e ubọchi asatọ gasiri mb͕e O kwusiri okwu ndia, na Ọ chiri Pita na Jọn na Jemes tiyere Onwe-ya, rigo n'ugwu ahu ikpe ekpere.
29 Mb͕e Ọ nēkpe ekpere, oyiyi iru-Ya we di iche, uwe-Ya we nācha ucha nēb͕u kwa dika àmùma.
30 Ma le, Ya na ndikom abua nēkwurita okwu, ndi bu Moses na Elaija;