11 olu we si n'elu-igwe ahu da, si, Gi onwe-gi bu Ọkparam M'huru n'anya, ihe-Gi dim ezi nma.
12 Ngwa ngwa Mọ Nsọ we chua Ya ba n'ọhia.
13 O we nọ n'ọhia ọgu ubọchi abua, Setan nānwa Ya; Ya na anu ọhia nile nọ kwa; ndi-mọ-ozi nēje-kwa-ra Ya ozi.
14 Ma mb͕e arasiiri Jọn nye, Jisus biara na Galili, nēkwusa ozi ọma Chineke,
15 si, Oge ezuwo, ala-eze Chineke di kwa nso: chègharianu, kwe-kwa-nu n'ozi ọma.
16 Mb͕e Ọ nāga n'usọ oké osimiri Galili, O we hu Saimon na Andru nwa-nne Saimon ka ha nāwuye úb͕ú n'oké osimiri: n'ihi na ha bu ndi-ọkù.
17 Jisus we si ha, Bianu som n'azu, M'gēme kwa ka unu buru ndi-ọkù nākuta madu.