Mak 7 IGBOB

1 Ha we zukọ n'ebe Ọ nọ, bú ndi-Farisi, na ufọdu nime ndi-ode-akwukwọ, ndi siri na Jerusalem bia,

2 ndi hu-kwa-ra na ufọdu nime ndi nēso uzo-Ya nēri nri-ha n'aka ruru árú, nke ahu bu, aka anākwọghi akwọ.

3 N'ihi na ndi-Farisi, na ndi-Ju nile, ọ buru na ha akwọchaghi aka-ha, ha adighi-eri ihe, n'ihi na ha nējide ozizí nke ndi-okenye nyere ha n'aka idebe:

4 ọzọ, mb͕e ha si n'ahia lata, ọ buru na ha efesaghi onwe-ha miri, ha adighi-eri ihe: ọtutu ihe ọzọ di kwa, nke ha natara ijide, dika ime iko, na ite, na ihe ọla, baptism.

5 Ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ we jua Ya, si, N'ìhi gini ka ndi nēso uzọ-Gi nējeghi ije dika ozizí ndi-okenye nyere ayi n'aka idebe, ma ha nēri nri-ha n'aka ruru árú?

6 Ma Ọ siri ha, Aisaia buru amuma nke-ọma n'isi unu ndi-iru-abua, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si,Ndi nka nāsọpurum n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha,Ma obi-ha di anya n'ebe M'nọ.

7 Ma ha nēbirim isi ala n'efu,Nēzí ihe madu nyere n'iwu ka ha buru ozizí-ha.

8 Unu nārapu ihe Chineke nyere n'iwu, jide kwa ozizí madu nyere n'aka-unu idebe.

9 O we si ha, Unu nāju ihe Chineke nyere n'iwu nke-ọma, ka unu we debe ozizí nke enyere n'aka-unu idebe.

10 N'ihi na Moses siri, Sọpuru nna-gi na nne-gi; na, Onye kwujọrọ nna ma-ọbu nne, ya nwua ọnwu ahu:

11 ma unu onwe-unu nāsi, Ọ buru na madu si nna-ya ma-ọbu nne-ya, Ihe ọ bula i gēritari n'akam bu Kọban, isi-ya bu, Ihe enyere Chineke;

12 unu ekweghi ya ọzo ka o mere nna-ya ma-ọbu nne-ya ihe ọ bula:

13 nēme okwu Chineke ka ọ buru ihe-efu site n'ozizí enyere unu n'aka idebe, nke unu nyere madu n'aka idebe: ọtutu ihe di otú a ka unu nēme kwa.

14 O we kpọ ìgwè madu ahu ọzọ biakute Ya, Ọ si ha, Nurunu okwum, unu nile, ghọta-kwa-nu:

15 ọ dighi ihe ọ bula di madu n'ìhè nke puru imeru ya, ma ọ buru na ọ ba nime ya: kama ihe si nime madu puta bu ihe nēmeru madu.

16 Ọ buru na onye ọ bula nwere nti inu ihe, ya nu.

17 Mb͕e Ọ ghara ìgwè madu ahu ba n'ulo, ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya isi ilu ahu.

18 O we si ha, Ùnu onwe-unu di kwa otú a ka ndi nēnweghi nghọta? Ùnu atugharighi uche-unu, na ihe ọ bula nke si n'ìhè ba nime madu, na ọ pughi imeru ya,

19 n'ihi na ọ bàghi n'obi-ya, kama n'afọ-ya, o we pua n'ulo-ǹsí? O kwuru nka, ka O me ka ihe-oriri nile di ọcha.

20 O we si, Ihe nke si nime madu puta, nke ahu nēmeru madu.

21 N'ihi na n'ime, bú n'obi madu, ka èchìchè nile jọrọ njọ si aputa, ikwa-iko nile, ori nile, ib͕u-madu nile,

22 ikwa-iko nile nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, anya-uku nile, ajọ ihe nile, aghughọ, agu ikwa-iko, ajọ anya, nkwulu, npakọ, enweghi-uche:

23 ajọ ihe ndia nile nēsi nime madu aputa, ha nēmeru madu.

24 O we si n'ebe ahu bilie, je n'ókè-ala Taia na Saidon. O we ba n'ulo, Ọ chọghi kwa ka onye ọ bula mara: ma apughi izota Ya.

25 Ma ngwa ngwa otù nwanyi, nke nwa-ya nwanyi nke-ntà nwere mọ nādighi ọcha, ebe ọ nuru ùdé-Ya, ọ bia da n'ala n'ukwu-Ya.

26 Ma nwanyi ahu bu onye-Grik, buru onye Sairo-Finisia n'ọmumu-ya. O we kpere Ya ka Ọ chupu mọ ọjọ ahu n'aru nwa-ya nwanyi.

27 O we si ya, Kwe ka afọ buru uzọ ju umu: n'ihi na ọ dighi nma inara nri umu tupuru umu-nkita.

28 Ma ọ zara, si Ya, E, Onye-nwe-ayi: ọbuná umu-nkita n'okpuru table nēri irighiri ufọdu na nri umu ntà.

29 O we si ya, N'ihi okwu a laba; mo ọjọ ahu apuwo n'aru nwa-gi nwanyi.

30 O we la n'ulo-ya, hu nwatakiri-ya na atọb͕ọrọ ya n'elu ihe-ndina-ya, hu kwa na mọ ọjo ahu apuwori.

31 O si-kwa-ra n'ókè-ala Taia pua ọzọ, we gabiga n'etiti Saidon, si n'etiti ókè-ala Dekapọlis, rue oké osimiri Galili.

32 Ha we kutara Ya otù onye nti chiri, nke nāsu kwa nsu; ha we riọ Ya ka O bikwasi ya aka-Ya.

33 O we si n'igwè madu ahu kupu ya iche, we tiye nkpisi-aka-Ya na nti-ya abua, bu kwa ọnu-miri, metu ire-ya;

34 O we le anya n'elu-igwe, sua udè, si ya, Efata, nke isi-ya bu, Ghere oghe.

35 Nti-ya abua we ghere oghe, ekike ire-ya tọpu kwa, o we kwuzi okwu.

36 O we gwasie ha ike ka ha ghara igwa onye ọ bula: ma ka ọ ra, bú otú Ya onwe-ya gwasiri ha ike, otú a ka ha nēkwusa kari ya nke-uku.

37 Ibobo nwubiga-kwa-ra ha ókè n'aru, ha si, O mewo ihe nile nke-ọma: Ọ nēme ọbuná ndi nti chiri ka ha nu ihe, me kwa ndi nāpughi ikwu okwu ka ha kwue.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16