Mak 12 IGBOB

1 O we malite igwa ha okwu n'ilu. Otù onye kuru ubi-vine, ọ b͕a ya ogige gburugburu, gwu kwa ebe inara manya agāzọchapu na nkpuru-vine, o wu-kwa-ra ulo-elu, were kwa ya tiye n'aka ndi-ọlu-ubi, we je ala ọzọ.

2 O we zigara ndi-ọlu-ubi ahu otù orù n'oge ighọ nkpuru, ka ọ nata n'aka ndi-ọlu-ubi nkpuru ufọdu n'ubi-vine-ya.

3 Ha we jide ya, pia ya ihe, zilaga ya n'aka efu.

4 Ọzọ kwa o we zigara ha orù ọzọ; ha we tiwa isi onye ahu, me ya ihe-ihere.

5 O we ziga onye ọzọ; ha we b͕ue onye ahu: na ọtutu ndi ọzọ; ha nāpia ufọdu ihe, nēb͕u kwa ufọdu.

6 O nwere otù onye fọduru, bú ọkpara ọ huru n'anya: o zigara ya ikpe-azu jekuru ha, si, Ha gāsọpuru ọkparam.

7 Ma ndi-ọlu-ubi ahu siritara onwe-ha, Nka bu onye-nketa; bianu, ka ayi b͕ue ya, ihe-nketa-ya gābu kwa nke ayi.

8 Ha we jide ya, b͕ue ya, tupu ya n'azu ubi-vine ahu.

9 Gini kwa ka onye-nwe ubi-vine ahu gēme? ọ gābia, la ndi-ọlu-ubi ahu n'iyì, were kwa ubi-vine ahu nye ndi ọzọ.

10 Ùnu agughi ọbuná ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ;Nkume nke ndi nēwu ulo juru,Nke ahu ka emere isi nkuku ulo:

11 Ọ bu n'aka Onye-nwe-ayi ka nka sitere,Ọ bu kwa oké ọlu n'anya-ayi?

12 Ha we chọ uzọ ijide Ya; ma ha turu egwu ìgwè madu ahu; n'ihi na ha mara na Ọ turu ilu a imegide ha; ha we rapu Ya, la.

13 Ha we zigara Ye ufọdu nime ndi-Farisi na ndi Herod, ka ha we nwude Ya n'okwu.

14 Ha we bia, si Ya, Onye-ozizí, ayi amatawo na I bu onye ezi-okwu, na I dighi-asọ kwa onye ọ bula anya: n'ihi na I dighi-ele madu anya n'iru, kama I nēzi uzọ Chineke n'ezi-okwu: ò ziri ezi n'iwu itu ùtú nye Sisa, ma-ọbu na ò zighi ezi?

15 Àyi gātu, ma-ọbu na ayi agaghi-atu? Ma ebe Ọ matara iru-abua-ha; Ọ si ha, Gini mere unu nānwam? wetaram otù shilling, ka M'hu ya.

16 Ha we weta ya. Ọ si ha, Ònye nwe onyinyo a na ihe a edekwasiri ya? Ha si Ya, Sisa nwe.

17 Jisus we si ha, Nyeghachinu Sisa ihe nke Sisa, nyeghachi-kwa-nu Chineke ihe nke Chineke. O we ju ha nile anya nke-uku bayere Ya.

18 Ndi-Sadusi, ndi si na nbilite-n'ọnwu adighi, we biakute Ya; ha we jua Ya, si,

19 Onye-ozizí, Moses dere akwukwọ nye ayi, si, Ọ buru na nwa-nne-nwoke onye ọ bula anwua, rapu nwunye n'azu, ma ọ rapughi nwa, ka nwa-nne-ya nwoke kuru nwunye-ya, me ka nkpuru toputara nwa-nne-ya.

20 Umu-nne-ndikom asa di: nke-mbu luru nwunye, we nwua nārapughi nkpuru;

21 nke-abua we kuru ya, nwu kwa, ọ rapughi kwa nkpuru n'azu; nke-atọ otú ahu kwa:

22 ndikom asa ahu arapughi nkpuru. N'ikpe-azu ha nile nwanyi ahu nwu-kwa-ra.

23 Na nbilite-n'ọnwu, nwùnye onye n'etiti ha ka ọ gābu? n'ihi na ha asa nwere ya na nwunye.

24 Jisus siri ha, Ọ̀ bughi n'ihi nka ka unu ji hie uzọ, na unu amataghi ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ma-ọbu ike Chineke?

25 N'ihi na mb͕e ha gēsi na ndi nwuru anwu bilie, ha alughi nwunye, enyeghi kwa ha n'ọlulu-di; kama ha di ka ndi-mọ-ozi di n'elu-igwe.

26 Ma n'okwu bayere ndi nwuru anwu, na anēme ka ha si n'ọnwu bilie; ùnu agughi n'akwukwọ Moses, n'ebe edere okwu bayere Osisi ntà, otú Chineke gwara ya, si, Mu onwem bu Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob?

27 Ọ bughi Chineke nke ndi nwuru anwu, kama Ọ bu nke ndi di ndu: unu onwe-unu nēhie uzọ nke-uku.

28 Otù onye nime ndi-ode-akwukwọ bia-kwa-ra, we nu ka ha nājurita onwe-ha ajuju, ma ebe ọ matara na Ọ zarari ha nke-ọma, ọ jua Ya, si, Òle nke bu nke-mbu n'ihe nile enyere n'iwu?

29 Jisus zara, si, Nke-mbu bu, Nuru, Israel; Onye-nwe-ayi, bú Chineke-ayi, Onye-nwe-ayi bu otù:

30 i gāhu kwa Onye-nwe-ayi, bú Chineke-gi, n'anya, site n'obi-gi dum, site kwa na nkpuru-obi-gi dum, site kwa n'uche-gi dum, site kwa n'ike-gi dum.

31 Nke-abua bu nke à, I gāhu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi. Ọ dighi ihe ọzọ enyere n'iwu nke dikariri ndia.

32 Ode-akwukwọ ahu we si Ya, Onye-ozizi, n'ezie I kwuru nke-ọma na Ọ bu otù; ọ dighi kwa chi ọzọ di ma-ọbughi Ya:

33 na ihu Ya n'anya site n'obi-gi dum, site kwa na nghọta-gi dum, site kwa n'ike-gi dum, na ihu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi, ọ kachasi àjà-nsuresi-ọku nile na àjà ọzọ nile nke-uku.

34 Mb͕e Jisus huru na ọ zara dika onye nwere uche, Ọ si ya, I nọghi ebe di anya n'ala-eze Chineke. Ma ọ dighi onye nwere anya-ike site na mb͕e ahu iju Ya ajuju.

35 Jisus we za, mb͕e Ọ nēzi ihe n'ulo uku Chineke, si, Ndi-ode-akwukwọ si aṅa kwu na Kraist ahu bu nwa Devid?

36 Devid onwe-ya siri nime Mọ Nsọ,Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem,Nọdu ala n'aka-nrim,Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Gi abua.

37 Devid onwe-ya nākpọ Ya Onye-nwe-ya; òle ebe O si buru kwa Nwa-ya? Oké ìgwè madu ahu we were obi-utọ nu okwu-Ya.

38 N'ozizi-Ya Ọ si kwa, Lezienu anya ndi-ode-akwukwọ, ndi nāchọ ijeghari n'uwe-nwuda, na inara ekele n'ọma-ahia nile unu,

39 na isi oche nile n'ulo-nzukọ-unu, na isi ọnọdu nile n'oriri nile unu:

40 ndi nēripia ulo ndinyom di-ha nwuru, nēkpe kwa ogologo ekpere ka madu we hu ha anya; ndia gēnwe ezi ọmuma-ikpe gabigara ókè kari ndi ọzọ.

41 O we nọdu n'ulo uku Chineke na ncherita-iru ebe anēdebe ùtú anātu, O we nēle otú ìgwè madu nātubà ego n'ebe ùtú ahu: ọtutu ndi bu ọgaranya nātubà kwa ri nne.

42 Otù nwayi, bú ob͕enye, nke di-ya nwuru, we bia, tubà ego ntà abua, nke mere otù farthing.

43 O we kpọ ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, Ọ si ha, N'ezie asim unu, Nwanyi a, bú ob͕enye, nke di-ya nwuru, ọ tubàra kari ndi nile nātubà nime ebe ùtú ahu:

44 n'ihi na ha nile sitere n'inwebiga-àkù-ókè-ha tubà; ma nwanyi ahu sitere n'ukọ-ya tubà ka ihe nile nke o nwere ra, bú ihe dum o ji biri.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16