Mak 4 IGBOB

1 Ọ we malite ọzọ izí ihe n'usọ oké osimiri. Oké ìgwè madu uku we zukọ n'ebe Ọ nọ, ya mere Ọ batara n'ub͕o, we nọdu ala n'osimiri; ìgwè madu ahu nile we nọ n'usọ oké osimiri n'elu ala.

2 O we zí ha ọtutu ihe n'ilu di iche iche, si ha n'ozizí-Ya,

3 Nurunu: Le, ọgha-nkpuru puru ka ọ gha nkpuru:

4 o rue, mb͕e ọ nāgha, ufọdu dara n'akuku uzọ, anu-ufe we bia tuturie ha.

5 Nkpuru ọzọ we da n'ala nkume, ebe ha nēnweghi ájá ri nne; ngwa ngwa ha we pulite, n'ihi na ha enweghi ájá di omimi:

6 ma mb͕e anyanwu wara, ha chanwua; ha we kpọnwua, n'ihi na ha enweghi nkpọrọgwu.

7 Nkpuru ọzọ we da n'etiti ogwu, ogwu ahu we tolite, kpab͕ue ha, ha amighi kwa nkpuru.

8 Nkpuru ọzọ we da n'ala di nma, ha we nāmi nkpuru, nētó nāba kwa uba; ha we mia, otù orú na iri, ọzọ ọgu atọ, ọzọ ọgu ise.

9 O we si, Onye nwere nti inu ihe, ya nu.

10 Mb͕e nání Ya nọ, ndi nọ Ya buruburu na ndikom iri na abua ahu we jua Ya ilu ahu.

11 O we si ha, Ọ bu unu ka enyeworo ihe-omimi ala-eze Chineke: ma anēmere ndi nọ n'èzí ihe nile n'ilu:

12 ka ha we hu n'ọhuhu, ghara ihuta; ka ha we nu kwa n'ọnunu, ghara inuta; ka ha ghara ichighari mb͕e ọ bula, ewe gb͕aghara ha.

13 O we si ha, Ùnu amataghi ilu a? ùnu gēsi kwa aṅa mara ilum nile?

14 Ọgha-nkpuru nāgha okwu Chineke.

15 Ma ndia bu ndi nọ n'akuku uzọ ahu, ebe anāgha okwu ahu; ma mb͕e ọ bula ha nuru, ngwa ngwa Setan abia, we napu okwu nke aghaworo nime ha.

16 Otú ahu, ndia bu kwa ndi anāgha n'ebe nkume ahu, ndi, mb͕e ọ bula ha nuru okwu ahu, ngwa ngwa ha were ọṅù jide ya;

17 ma ha enweghi nkpọrọgwu nime onwe-ha, kama ha nānọ nwa oge; emesia, mb͕e nkpab͕u ma-ọbu nsob͕u putara n'ihi okwu ahu, ngwa ngwa ha ma n'ọnyà.

18 Ndi ọzọ bu kwa ndi anāgha n'etiti ogwu ahu; ndia bu ndi nuru okwu ahu,

19 ma ncheb͕u nile nke oge a, na aghughọ nke àkù, na nbata nke agu ihe di iche iche ọzọ, nākpab͕u okwu ahu, o we ghọ ihe nāmighi nkpuru.

20 Ndi ahu bu kwa ndi aghara n'ala ahu di nma; ndi ọ bula ndi nānu okwu ahu, we nara ya, we mia nkpuru, otù orú na iri, ọzọ ọgu atọ, ọzọ ọgu ise.

21 O we si ha, Ànēbute oriọna ka adọba ya n'okpuru mb͕é', ma-ọbu n'okpuru ihe-ndina? ọ̀ bughi ka adọba ya n'elu ihe-idọba-oriọna?

22 N'ihi na ọ dighi ihe ezoro ezo, ma-ọbughi ka ewe me ka ọ puta ìhè; ọ dighi kwa ihe emere ka ọ buru ihe ezoro ezo, kama ọ bu ka o we puta ìhè.

23 Ọ buru na onye ọ bula nwere nti inu ihe, ya nu.

24 O we si ha, Lezienu anya ihe unu nānu: ihe unu ji tù ihe ka agēji tùru unu: agēnye kari kwa unu.

25 N'ihi na onye nwere, onye ahu ka agēnye: onye nēnweghi kwa, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya.

26 O we si, ọ bu otu a ka ala-eze Chineke di, ọ di ka mb͕e madu tupuru nkpuru n'ala;

27 we raru ura teta kwa abali na ehihie, nkpuru ahu we pue tó kwa, onye ahu amaghi ka o si me.

28 Ala nāmi nkpuru site n'onwe-ya; mbu npute, emesia oko, emesia ọka kara aka n'oko.

29 Ma mb͕e ọ bula nkpuru chara, ngwa ngwa o were mma-iwe-ihe-ubi webe, n'ihi na mb͕e owuwe-ihe-ubi abiawo.

30 O we si, Ayi gēsi aṅa tunyere ala-eze Chineke? ma-ọbu n'ìlu gini ka ayi gātu ya?

31 Ọ di ka nkpuru mustard, nke, mb͕e ọ bula aghara ya n'ala, ọ bu ezie na ọ di ntà kari nkpuru nile di n'ala;

32 ma mb͕e ọ bula aghara ya, o tó, ghọ ihe bùkari ihe nile anāku n'ubi, o we waputa oké alaka; nke mere ka anu-ufe nile nke elu-igwe pu inọ n'okpuru ǹdò-ya.

33 O nēji kwa ọtutu ilu di otú a gwa ha okwu Chineke, dika ha puru inu ya:

34 ma asi na O jighi ilu Ọ dighi-agwa ha okwu: ma mb͕e Ya na ha nọ iche Ọ nākọrọ ndi nke Ya nēso uzọ-Ya ihe nile.

35 N'ubọchi ahu, mb͕e o ruru anyasi, O we si ha, Ka ayi gabiga n'ofè ọzọ.

36 Ha we rapu ìgwè madu ahu, we kuru Ya, otú di, tiyere onwe-ha n'ub͕ọ ahu. Ub͕ọ ufọdu ọzọ di kwa nke nēso Ya.

37 Oké ajọ ifufe we fe, ebili-miri we nāwubà n'ub͕o ahu, ya mere na miri nēju n'ub͕ọ ub͕u a.

38 Ma Ya onwe-ya nọ n'isi ub͕ọ, nāraru ura n'elu ohiri-isi: ha we kpọte Ya, Si Ya, Onye-ozizí, Ò metughi Gi n'obi na ayi nāla n'iyì?

39 O we teta, bara ifufe nba, si kwa oké osimiri, Di jū, kpuchie ọnu-gi. Ifufe we febìe, oké ndaju we di.

40 O we si ha, Gini mere unu nātu ujọ? ùnu akēnweghi okwukwe?

41 Ha we tua oké egwu, sirita onwe-ha, Ònye bu kwa onye a, na ọbuná ifufe na oké osimiri nāṅa Ya nti?

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16