7 Ọ nēkwusa kwa, si, Onye kam ike nābia n'azum, Onye m'nērughi iruru ala itọpu eriri akpukpọ-ukwu-Ya abua.
8 Mu onwem jiri miri me unu baptism; ma Onye ahu geji Mọ Nsọ me unu baptism.
9 O rue na mb͕e ahu, Jisus siri na Nazaret nke Galili bia, Jọn we mee Ya baptism nime Jọdan.
10 Ngwa ngwa mb͕e O si na miri nārigo, Ọ huru elu-igwe ka ha nādọwa, Ọ hu-kwa-ra Mọ Nsọ dika nduru ka Ọ nēfedakwasi Ya:
11 olu we si n'elu-igwe ahu da, si, Gi onwe-gi bu Ọkparam M'huru n'anya, ihe-Gi dim ezi nma.
12 Ngwa ngwa Mọ Nsọ we chua Ya ba n'ọhia.
13 O we nọ n'ọhia ọgu ubọchi abua, Setan nānwa Ya; Ya na anu ọhia nile nọ kwa; ndi-mọ-ozi nēje-kwa-ra Ya ozi.