1 O we si n'ebe ahu bilie, bia n'ókè-ala Judia, ya na ofè ọzọ nke Jọdan: ìgwè madu nile we zukọ ọzọ n'ebe Ọ nọ; ka O siri eme, O we nēzí ha ihe ọzọ.
2 Ndi-Farisi we biakute Ya, jua Ya, si, Ò ziri ezi n'iwu ka nwoke rapu nwunye-ya? nānwa Ya.
3 O we za, si ha, Gini ka Moses nyere unu n'iwu?
4 Ha we si, Moses kwere ka ede akwukwọ nkewa, ka arapu kwa ya.
5 Ma Jisus siri ha, N'ihi obi-etili-unu ka o dere unu iwu a n'akwukwọ.
6 Ma site na nmalite òkìkè uwa, Nwoke na nwanyi ka O mere ha.
7 N'ihi nka ka nwoke gēji rapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya;