33 si, Le, ayi nārigoro Jerusalem; agārara kwa Nwa nke madu nye n'aka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ; ha gāma kwa Ya ikpe ọnwu, rara Ya nye n'aka ndi mba ọzọ:
34 ha gēme kwa Ya ihe-ọchi, busa Ya ọnu-miri, pia Ya ihe, b͕ue Ya: Ọ gēsi kwa n'ọnwu bilie mb͕e ubọchi atọ gasiri.
35 Jemes na Jọn, bú umu Zebedi, we biakute Ya, si Ya, Onye-ozizí, ayi nāchọ ka I mere ayi ihe ọ bula ayi gāriọ Gi.
36 O we si ha, Gini ka unu nāchọ ka M'mere unu?
37 Ha we si Ya, Me ayi ka ayi nọdu, otù n'aka-nri-Gi, otù n'aka-ekpe, n'ebube-Gi.
38 Ma Jisus siri ha, Unu amataghi ihe unu nāriọ. Ùnu puru iṅu iko ahu nke Mu onwem nāṅu? ma-ọbu ka eme unu baptism ahu dika anēme Mu onwem?
39 Ha we si Ya, Ayi puru. Jisus we si ha, Iko Mu onwem nāṅu ka unu gaṅu; baptism nke anēme Mu onwem ka agēme kwa unu: