6 Ma site na nmalite òkìkè uwa, Nwoke na nwanyi ka O mere ha.
7 N'ihi nka ka nwoke gēji rapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya;
8 ha abua ewe ghọ otù anu-aru: ya mere ha abughi kwa madu abua ọzọ, kama ọ bu otù anu-aru.
9 Ya mere, ihe Chineke kekọtara, madu atọsala.
10 N'ulo ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya ajuju okwu a ọzọ.
11 O we si ha, Onye ọ bula nke gārapu nwunye-ya, luru kwa nwunye ọzọ, ọ nākwa iko megide ya:
12 ọ buru kwa na nwanyi onwe-ya arapu di-ya, luru kwa di ọzọ, ọ nākwa iko.