26 Ma ọ buru na unu onwe-unu ab͕agharaghi, Nna-unu Nke bi n'elu-igwe agaghi-ab͕aghara unu ndahie nile unu.
27 Ha we bia rue Jerusalem ọzọ: mb͕e Ọ nējeghari n'ulo uku Chineke, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ na ndi-okenye we biakute Ya;
28 ha we si Ya, Ọ̀ bu n'aha ike gini ka I nēme ihe ndia? ma-ọbu ònye nyere Gi ike a ka I we me ihe ndia?
29 Ma Jisus siri ha, M'gāju unu otù okwu, unu zakwam, emesia M'gāgwa unu aha ike M'ji eme ihe ndia.
30 Baptism nke Jọn, ò sitere n'elu-igwe, ma-ọbu na ò sitere n'aka madu? zanum.
31 Ha we kwurita n'etiti onwe-ha, si, Ọ buru na ayi asi, O sitere n'elu-igwe; Ọ gasi, N'ìhi gini kwa ka unu nējighi kwe ya?
32 Ma àyi gāsi kwa, O sitere n'aka madu? ha nātu egwu ndi-Ju: n'ihi na madu nile guru Jọn na ọ bu onye-amuma n'ezie.