1 O we malite igwa ha okwu n'ilu. Otù onye kuru ubi-vine, ọ b͕a ya ogige gburugburu, gwu kwa ebe inara manya agāzọchapu na nkpuru-vine, o wu-kwa-ra ulo-elu, were kwa ya tiye n'aka ndi-ọlu-ubi, we je ala ọzọ.
2 O we zigara ndi-ọlu-ubi ahu otù orù n'oge ighọ nkpuru, ka ọ nata n'aka ndi-ọlu-ubi nkpuru ufọdu n'ubi-vine-ya.
3 Ha we jide ya, pia ya ihe, zilaga ya n'aka efu.
4 Ọzọ kwa o we zigara ha orù ọzọ; ha we tiwa isi onye ahu, me ya ihe-ihere.
5 O we ziga onye ọzọ; ha we b͕ue onye ahu: na ọtutu ndi ọzọ; ha nāpia ufọdu ihe, nēb͕u kwa ufọdu.