10 Ùnu agughi ọbuná ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ;Nkume nke ndi nēwu ulo juru,Nke ahu ka emere isi nkuku ulo:
11 Ọ bu n'aka Onye-nwe-ayi ka nka sitere,Ọ bu kwa oké ọlu n'anya-ayi?
12 Ha we chọ uzọ ijide Ya; ma ha turu egwu ìgwè madu ahu; n'ihi na ha mara na Ọ turu ilu a imegide ha; ha we rapu Ya, la.
13 Ha we zigara Ye ufọdu nime ndi-Farisi na ndi Herod, ka ha we nwude Ya n'okwu.
14 Ha we bia, si Ya, Onye-ozizí, ayi amatawo na I bu onye ezi-okwu, na I dighi-asọ kwa onye ọ bula anya: n'ihi na I dighi-ele madu anya n'iru, kama I nēzi uzọ Chineke n'ezi-okwu: ò ziri ezi n'iwu itu ùtú nye Sisa, ma-ọbu na ò zighi ezi?
15 Àyi gātu, ma-ọbu na ayi agaghi-atu? Ma ebe Ọ matara iru-abua-ha; Ọ si ha, Gini mere unu nānwam? wetaram otù shilling, ka M'hu ya.
16 Ha we weta ya. Ọ si ha, Ònye nwe onyinyo a na ihe a edekwasiri ya? Ha si Ya, Sisa nwe.