7 Ma ndi-ọlu-ubi ahu siritara onwe-ha, Nka bu onye-nketa; bianu, ka ayi b͕ue ya, ihe-nketa-ya gābu kwa nke ayi.
8 Ha we jide ya, b͕ue ya, tupu ya n'azu ubi-vine ahu.
9 Gini kwa ka onye-nwe ubi-vine ahu gēme? ọ gābia, la ndi-ọlu-ubi ahu n'iyì, were kwa ubi-vine ahu nye ndi ọzọ.
10 Ùnu agughi ọbuná ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ;Nkume nke ndi nēwu ulo juru,Nke ahu ka emere isi nkuku ulo:
11 Ọ bu n'aka Onye-nwe-ayi ka nka sitere,Ọ bu kwa oké ọlu n'anya-ayi?
12 Ha we chọ uzọ ijide Ya; ma ha turu egwu ìgwè madu ahu; n'ihi na ha mara na Ọ turu ilu a imegide ha; ha we rapu Ya, la.
13 Ha we zigara Ye ufọdu nime ndi-Farisi na ndi Herod, ka ha we nwude Ya n'okwu.