1 Mb͕e Ọ nāputa n'ulo uku Chineke, otù onye n'etiti ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, Onye-ozizí, le aha nkume na aha owuwu-ulo ndia bu!
2 Jisus we si Ya, Ì huru oké owuwu-ulo ndia? Agaghi-arapu otù nkume ma-ọli n'ebe a n'elu nkume-ibe-ya, nke anāgaghi-akwatu n'ala.
3 Mb͕e Ọ nānọdu n'elu ugwu Olive na ncherita-iru ulo uku Chineke, Pita na Jemes na Jọn na Andru we jua Ya iche, si,
4 Gwa ayi, òle mb͕e ihe ndia gābu? gini gābu kwa ihe-iriba-ama mb͕e ọ bula agaje imezu ihe ndia nile?
5 Ma Jisus malitere isi ha, Lezienu anya ka onye ọ bula ghara iduhie unu.
6 Ọtutu madu gābia n'aham, si, Mu onwem bu Ya; ha gēduhie kwa ọtutu madu.