16 onye nọ kwa n'ubi, ya ghara ilaghachi ichiri uwe-ya.
17 Ma ahuhu gādiri ndi di ime na ndi nēnye nwa ara na mb͕e ahu.
18 Ma kpenu ekpere ka ọ ghara idi na mb͕e oyi.
19 N'ihi na mb͕e ahu gābu nkpab͕u, nke aha nkpab͕u di otú a akādighi site na nmalite òkìkè-uwa nke Chineke kère rue mb͕e a, ọ gaghi-adi kwa ma-ọli.
20 Ọ buru kwa na Onye-nwe-ayi emeghi ubọchi ahu ka ha di nkpirikpi, agaghi-azọputa madu ọ bula: ma n'ihi ndi arọputara, ndi Ọ rọputara, O mere ka ubọchi ahu di nkpirikpi.
21 Mb͕e ahu ọ buru na onye ọ bula gāsi unu, Le, Kraist nọ n'ebe a; ma-ọbu, Le, n'ebe ahu; unu ekwela:
22 n'ihi na Kraist ugha di iche iche na ndi-amuma ugha gēbili, gosi kwa ihe-iriba-ama di iche iche na ọlu-ebube di iche iche, ka ha we duhie ndi arọputara, ma ọ buru na ọ gēkwe me.