2 Jisus we si Ya, Ì huru oké owuwu-ulo ndia? Agaghi-arapu otù nkume ma-ọli n'ebe a n'elu nkume-ibe-ya, nke anāgaghi-akwatu n'ala.
3 Mb͕e Ọ nānọdu n'elu ugwu Olive na ncherita-iru ulo uku Chineke, Pita na Jemes na Jọn na Andru we jua Ya iche, si,
4 Gwa ayi, òle mb͕e ihe ndia gābu? gini gābu kwa ihe-iriba-ama mb͕e ọ bula agaje imezu ihe ndia nile?
5 Ma Jisus malitere isi ha, Lezienu anya ka onye ọ bula ghara iduhie unu.
6 Ọtutu madu gābia n'aham, si, Mu onwem bu Ya; ha gēduhie kwa ọtutu madu.
7 Ma mb͕e ọ bula unu gānu okwu agha di iche iche na akukọ agha di iche iche, unu atula ujọ: ihe ndia aghaghi iputa; ma ọgwugwu ihe nile akērughi.
8 N'ihi na mba gēbili imegide mba ọzọ, ala-eze gēbili kwa imegide ala-eze ọzọ: ala-ọma-jijiji gādi n'ebe di iche iche; oké unwu di iche iche gādi: ihe ndia bu nmalite ihe-nb͕u.