23 Ma unu onwe-unu lezie anya: le, agwawom unu ihe nile mb͕e akēmeghi ha.
24 Ma na mb͕e ahu, mb͕e nkpab͕u ahu gasiri, anyanwu gāb͕a ọchichiri, ọnwa agaghi-enye kwa ihè-ya,
25 kpakpando nile ganāda kwa site n'elu-igwe, agēme kwa ka ike nile nke di n'elu-igwe me nkpatu.
26 Mb͕e ahu ha gāhu kwa Nwa nke madu ka Ọ nābia n'igwe-oji nile n'oké ike na ebube.
27 Mb͕e ahu Ọ gēzipu kwa ndi-mọ-ozi-Ya, me ka ndi nke Ya arọputara si n'ifufe anọ zukọ, site na nsọtu uwa rue nsọtu elu-igwe.
28 Ma site n'aru osisi fig mutanu ilu-ya: mb͕e ọ bula alaka-ya dibara nrò ub͕u a, pute kwa akwukwọ-ndu-ya, unu mara na mb͕e okpom-ọku di nso;
29 otú a unu onwe-unu kwa, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe ndia ka ha nāputa, maranu na Ọ nọ nso, n'ọnu-uzo.