1 Ma ememe ngabiga na achicha ekoghi-eko gādi mb͕e ubọchi abua gasiri: ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we nāchọ uzọ ha gēsi jide Ya n'aghughọ, b͕ue Ya:
2 n'ihi na ha nāsi, Ọ bughi n'ememe a, ka ùzù ndi-Ju we ghara idi ma eleghi anya.
3 Mb͕e Ọ nọ na Betani n'ulo Saimon onye-ekpenta, mb͕e Ọ nānọdu na nri, otù nwanyi we bia nke nēji ite alabaster, nke manu-otite ezi nard di oké ọnu-ahia nke-uku di ya; ọ kuwara ite ahu, we wusa manu-otite ahu n'isi-ya.
4 Ma ufọdu di ndi iwe nēwe nke-uku n'etiti ha, ha si, Àlawo manu-otite a n'iyì otú a iji me gini?