6 Ma Jisus siri, Rapunu ya; gini mere unu nēsob͕u ya? ọ luru ọlu ọma n'arum.
7 N'ihi na unu nwere ndi-ob͕enye n'etiti unu mb͕e nile, mb͕e ọ bula unu chọrọ unu puru ime kwa ha ihe ọma: ma unu enweghi Mu onwem mb͕e nile.
8 O mere ihe ọ nwere ike ime: o buru uzọ te arum manu-otite ka ewe doziem n'olìlì.
9 Ma n'ezie asim unu, Ebe ọ bula agēkwusa ozi ọma nka n'uwa dum, agēkwuta kwa ihe nke nwanyi a mere, ka ọ buru ihe-ncheta-ya.
10 Judas Iskariot, onye nke bu otù nime ndi-ozi iri na abua ahu, we jekuru ndi-isi-nchu-àjà, ka o we rara Ya nye n'aka-ha.
11 Ma mb͕e ha nuru ya ha ṅuria ọṅu, we kwe nkwa inye ya ego. Ọ we nāchọ oghere o gēsi rara Ya nye.
12 N'ubọchi mbu nke achicha ekoghi-eko, mb͕e ha nāchu aja ngabiga, ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, Òle ebe I nāchọ ka ayi je dozie ka I we rie oriri ngabiga?