12 Ọ nābasi-kwa-ra ha nba ike, ka ha ghara ime ka Ọ puta ìhè.
13 O we rigo n'ugwu ahu, kpọ ha biakute Ya, bú ndi Ya onwe-ya chọrọ: ha we jekuru Ya.
14 O we me ndikom iri na abua, ka Ya na ha we biri, ka O we nēzipu kwa ha ikwusa ozi ọma,
15 na inwe ike ichupu ndi-mọ ọjọ:
16 Saimon ka O nyekwasiri aha Pita;
17 na Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne Jemes; ha ka O nyekwasiri aha Boanajis, nke bu, Umu éb͕è-elu-igwe:
18 na Andru, na Filip, na Batọlọmiu, na Matiu, na Tomas, na Jemes nwa Alfiọs, na Tadiọs, na Saimon Kananaiọs,