24 Ọzọ, ọ buru na ala-eze ekewa megide onwe-ya, ala-eze ahu apughi iguzo.
25 Ọ buru kwa na èzí-na-ulo ekewa megide onwe-ya, èzí-na-ulo ahu agaghi-apu iguzo.
26 Ọ buru kwa na Setan ebiliwo megide onwe-ya, we kewa, ọ pughi iguzo, kama o nwere ọgwugwu.
27 Ma ọ dighi onye ọ bula puru ibà n'ulo onye di ike, na ipunara ya ihe-ya nile, ma ọ buru na o bughi uzọ ke onye ahu di ike ab͕u; mb͕e ahu ọ gāpunara kwa ya ihe di n'ulo-ya.
28 N'ezie asim unu, Na agāb͕aghara umu madu nmehie-ha nile, na nkwulu-ha, ka ha ra, bú nke ha gēji kwulu:
29 ma onye ọ bula nke gēkwulu Mọ Nsọ enweghi nb͕aghara rue mb͕e ebighi-ebi, ma nmehie ebighi-ebi nātuhi ya:
30 n'ihi na ha nāsi, O nwere mọ nādighi ọcha.