1 O we si n'ebe ahu pua; O we bia n'ala nke aka Ya; ndi nēso uzọ-Ya so kwa Ya.
2 Mb͕e ubọchi-izu-ike ruru, O we malite izi ihe n'ulo-nzukọ-ha: mb͕e ha nuru Ya ibobo we nwua ọra madu n'aru, ha si, Òle ebe ka Nwoke a nwere ihe ndia? ha si kwa, Gini bu amam-ihe enyere Nwoke a? òle isi ọlu ike di otú a aluru n'aka-Ya?
3 Nwoke a, Ọ̀ bughi onye-ọ̀kà ahu, nwa Meri, na nwa-nne Jemes, na Joses, na Judas, na Saimon? umu-nne-Ya ndinyom, hà anọghi kwa n'ebe a n'etiti ayi? Ewe me ka ha ma n'ọnyà n'aru Ya.
4 Jisus we si ha, Onye-amuma abughi onye adighi-asọpuru, ma-ọbughi n'ala nke aka ya, na n'etiti ikwu-ya, na n'ulo-ya.