51 O we rigokuru ha n'ub͕ọ; ifufe we febìe: ibobo we nwubiga ha ókè n'aru ri nne n'onwe-ha;
52 n'ihi na ha aghọtaghi ọlu ebube nke ob͕e achicha ise, kama emereri ka obi-ha me etili.
53 Mb͕e ha gabigasiri, ha bia rue ala rue Genesaret, tinye ub͕ọ-ha n'ala.
54 Mb͕e ha putara n'ub͕ọ, ngwa ngwa ọra we mazu Ya,
55 we b͕aghari n'ala ahu dum, malite ibughari ndi aru nādighi nma n'ute-ha, n'ebe ha nuru na Ọ nọ.
56 Ebe ọ bula Ọ batara, n'obodo ntà, ma-ọbu n'obodo, ma-ọbu n'ubi, ha we nātọb͕ọ ndi aru-ha nādighi ike n'ọma-ahia, ha nāriọ kwa Ya ka ha metu ọbuná ọnu-ọnu uwe-Ya aka: ewe zọputa ha, ka ha ra, bú ndi meturu Ya aka.