11 Ha we jua Ya, si, Ndi-ode-akwukwọ si aṅa kwu na Elaija aghaghi ibu uzọ bia?
12 O we si ha, Ọ bu ezie na Elaija bu uzọ bia, nēme kwa ka ihe nile di ka ha di na mbu: èsiwo kwa aṅa ede okwu a bayere Nwa nke madu n'akwukwọ nsọ, na Ọ gāhu ọtutu ahuhu, eme kwa Ya ihe-efu?
13 Ma asim unu, na Elaija abiawo, ha me-kwa-ra ya ka ihe ha chọrọ ra, dika edeworo okwu bayere ya n'akwukwọ nsọ.
14 Mb͕e ha biakutere ndi nēso uzọ-Ya, ha we hu oké ìgwè madu ka ha nọ ha buruburu, ha hu kwa ndi-ode-akwukwọ ka ha nāju ha ajuju.
15 Ngwa ngwa ibobo we nwua ìgwè madu ahu nile si-ike n'aru, mb͕e ha huru Ya, ha we b͕akuru Ya, kele Ya.
16 O we jua ha, si, Àjuju gini ka unu nāju ha?
17 Otù nwoke we si n'ìgwè madu ahu za Ya, si, Onye-ozizi, ekutaram I nwam nwoke, nke nwere mọ nādighi-ekwu okwu;