44 ebe ikpuru-ha nādighi-anwu, ọku-ha adighi-anyu kwa anyu.
45 Ọ buru kwa na ukwu-gi eme gi ka i ma n'ọnyà, bipu ya: ọ di gi nma ibà na ndu na ngwurọ, kari inwe ukwu-gi abua atubà gi n'ọku ala-mọ;
46 ebe ikpuru-ha nādighi-anwu, ọku-ha adighi-anyu kwa anyu.
47 Ọ buru kwa na anya-gi eme gi ka i ma n'ọnyà, tupu ya: ọ di gi nma ibà n'ala-eze Chineke nēnwe otù anya, kari inwe anya abua atubà gi n'ọku ala-mọ;
48 ebe ikpuru nke nēri ha nādighi-anwu, ọku anyughi kwa anyu.
49 N'ihi na agēji ọku b͕a onye ọ bula nnú.
50 Nnú di nma: ma ọ buru na nnú etufuwo utọ-ya, gini ka unu gēji me ya ka ọ di utọ? Nwenu nnú nime unu, unu na ibe-unu di kwa n'udo.