5 N'ihi na ọ̀ bu onye n'etiti ndi-mọ-ozi ka Ọ siri mb͕e ọ bula,Ọkparam ka Gi onwe-gi bu,Mu onwem amuwo Gi ta?ọzọ kwa,Mu onwem gāburu Ya Nna,Ya onwe-ya gābu-kwa-ram Ọkpara?
6 Ma ọzọ kwa, mb͕e ọ bula Ọ gākpọbatawori Ọkpara ahu n'elu-uwa ebe madu bi, Ọ si, Ka ndi-mọ-ozi nile nke Chineke kpọ kwa isi ala nye Ya.
7 Ọ nēkwu kwa ihe bayere ndi-mọ-ozi, si,Onye nēme ndi-mọ-ozi-Ya ka ha buru ifufe,Nēme kwa ndi nējere Ya ozi ka ha buru ọku nēnwu enwu:
8 ma Ọ nēkwu ihe bayere Ọkpara ahu, si,Oche-eze-gi, Chineke, nādiru mb͕e nile ebighi-ebi;Nkpa-n'aka-eze nke izi-ezi ka nkpa-n'aka nke ala-eze-Gi bu kwa.
9 I huru ezi omume n'anya, we kpọ nmebi-iwu asì;N'ihi nka Chineke, bú Chineke-Gi, tere GiManu obi-utọ n'isi kari ndi-nketa-ibe-Gi.
10 Ọzọ kwa,Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, na mbu ka I tọrọ ntọ-ala nke uwa;Ọlu aka-Gi ka elu-igwe bu kwa:
11 Ha onwe-ha gāla n'iyì; ma Gi onwe-gi nānọgide:Ha nile gāka kwa nká dika uwe;