8 ma Ọ nēkwu ihe bayere Ọkpara ahu, si,Oche-eze-gi, Chineke, nādiru mb͕e nile ebighi-ebi;Nkpa-n'aka-eze nke izi-ezi ka nkpa-n'aka nke ala-eze-Gi bu kwa.
9 I huru ezi omume n'anya, we kpọ nmebi-iwu asì;N'ihi nka Chineke, bú Chineke-Gi, tere GiManu obi-utọ n'isi kari ndi-nketa-ibe-Gi.
10 Ọzọ kwa,Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, na mbu ka I tọrọ ntọ-ala nke uwa;Ọlu aka-Gi ka elu-igwe bu kwa:
11 Ha onwe-ha gāla n'iyì; ma Gi onwe-gi nānọgide:Ha nile gāka kwa nká dika uwe;
12 Dika ákwà-nb͕okwasi ka I gāpiakọta kwa ha,Dika uwe, agāb͕anwe kwa ha:Ma Gi onwe-gi bu Onye ahu Nke nādi mb͕e nile,Arọ-Gi nile agaghi-agwu kwa agwu.
13 Ma ọ̀ bu onye n'etiti ndi-mọ-ozi ka O kwuworo okwu bayere ya mb͕e ọ bula, si,Nọdu ala n'aka-nrim,Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi ukwu-Gi abua?
14 Hà nile abughi ndi-mọ nēfè òfùfè, ndi eziputara ije ozi n'ihi ndi gaje iketa nzọputa?