1 N'ihi na Melkizedek nka, eze Selem, onye-nchu-àjà nke Chineke Onye kachasi ihe nile elu, onye zutere Abraham mb͕e o si n'ob͕ub͕u ndi-eze ahu laghachi, we gọzie ya,
2 onye Abraham kè-kwa-ra otù uzọ n'uzọ iri n'ihe nile nye, (ebe ọ bu mbu, ma asugharia aha-ya, Eze nke ezi omume, buru kwa ma emesia Eze nke Selem, nke bu, Eze nke udo;
3 enweghi nna, enweghi nne, enweghi akukọ osuso-ọmumu, enweghi nmalite ubọchi ma-ọbu ọgwugwu ndu, ma emewo ya ka o yie Ọkpara Chineke), ọ nānọgide onye-nchu-àjà mb͕e nile.
4 Ma lenu otú onye a di uku, onye Abraham, bú nna-ayi mbu, nyere otù uzọ n'uzọ iri n'isi ihe alutara n'agha.