4 Ya mere ọ buru na Ọ nọ n'uwa, Ọ gaghi-abu onye-nchu-àjà ma-ọli, ebe ndi nēche onyinye ahu nile n'iru Chineke dika iwu si di nọ:
5 ndi-nchu-àjà ndi nēkpe ekpere nime ihe-nṅomi na onyinyo nke ebe di n'elu-igwe, dika Chineke duworo Moses ọdú mb͕e ọ gaje imazu ulo-ikwū ahu: n'ihi na Ọ nāsi, Le anya ka i me ihe nile dika ihe-atù ahu si di nke egosiri gi n'ugwu.
6 Ma otú ọ di, O ruwo n'ifè-òfùfè nke ka nma, n'uzọ ra otú Ọ bu kwa onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ka nma, bú ọb͕ub͕a-ndu nke enyeworo n'iwu n'elu nkwa ufọdu ka nma.
7 N'ihi na asi na ọb͕ub͕a-ndu mbu ahu adighi ita uta, agaghi-achọwori ebe nye ọb͕ub͕a-ndu nke-abua.
8 N'ihi na mb͕e Ọ nāta ha uta, Ọ si,Le, ubọchi nābia, ka Onye-nwe-ayi kwuru,Mb͕e Mu na ulo Israel na ulo Juda gāb͕a ọb͕ub͕a-ndu ọhu;
9 Ọ bughi dika ọb͕ub͕a-ndu ahu si di nke Mu na ndi bu nna-ha b͕araN'ubọchi M'jidere ha n'aka isi n'ala Ijipt duputa ha;N'ihi na ha onwe-ha anọgideghi n'ọb͕ub͕a-ndum,Mu onwem lefukwara ha anya, ka Onye-nwe-ayi kwuru,
10 N'ihi na nka bu ọb͕ub͕a-ndu nke Mu na ulo Israel gāb͕aMb͕e ubọchi nile ahu gasiri, ka Onye-nwe-ayi kwuru;M'gētiye iwum n'uche-ha,Ọ bu kwa n'obi-ha ka M'gēdekwasi ha dika n'akwukwọ:M'gābu-kwa-ra ha Chineke,Ha onwe-ha gābu-kwa-ram otù ndi: