11 ọ we nara ihe-iriba-ama nke bu obibì-úgwù, bú akàrà nke ezi omume nke okwukwe ahu nke di n'ebìghi-úgwù-ya: ka o we buru nna nke ndi nile kwere, ọ bu ezie na ha nọ n'ebìghi-úgwù, ka ewe gua ezi omume nye ha;
12 ka o we buru kwa nna nke obibì-úgwù n'ebe ndi ahu nọ, bú ndi nābughi nání ndi sitere n'obibì-úgwù, kama ha nēsozi kwa ije-ukwu nke okwukwe ahu nke nna-ayi Abraham, nke o nwere n'ebìghi-úgwù.
13 N'ihi na esiteghi n'iwu kwere Abraham ma-ọbu nkpuru-ya nkwa, na ọ gābu onye-nketa nke uwa, kama o sitere n'ezi omume nke okwukwe.
14 N'ihi na asi na ndi ahu ndi sitere n'iwu bu ndi-nketa, emewo okwukwe ka ọ buru ihe-efu, me kwa nkwa ahu ka ọ ghara idi irè:
15 n'ihi na iwu ahu nāluta iwe; ma ebe iwu nādighi, njehie adighi kwa.
16 N'ihi nka o sitere n'okwukwe, ka o we di ka amara si di; ka nkwa ahu we guzosie ike n'ebe nkpuru ahu nile nọ; ọ bughi nání ndi sitere n'iwu ahu, kama ọ bu kwa ndi sitere n'okwukwe Abraham, onye bu nna nke ayi nile.
17 (dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Nna nke ọtutu mba ka M'meworo gi,) n'iru Onye o kwere, bú Chineke, Onye nēme ndi nwuru anwu ka ha di ndu, Onye nākpọ kwa ihe nādighi, dika asi na ha di.