16 O nwe-kwa-ra kpakpando asa n'aka-nri-Ya: mma-agha di nkọ nke nwere iru abua nēsi kwa n'ọnu-Ya puta: iru-Ya di kwa ka anyanwu nāmu n'ike-ya.
17 Mb͕e m'huru Ya, m'we da n'ala n'ukwu-Ya dika onye nwuru anwu. O we bikwasim aka-nri-Ya, si, Atula egwu; Mu onwem bu onye mbu na onye ikpe-azu,
18 buru kwa Onye ahu nādi ndu; aghọ-kwa-ram onye nwuru anwu, ma le, anamadi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, enwe-kwa-ram nkpisi-ugodi nile nke ọnwu na nke Hedis
19 Ya mere, de ihe nile i huru n'akwukwọ, ha na ihe nke nādi adi, na ihe nile nke gaje iputa mb͕e ihe ndia gasiri;
20 ihe-omimi nke kpakpando asa ahu nke i huru n'aka-nrim, na ihe-idọba-oriọna asa ahu nke eji ọla-edo me. Kpakpando asa ahu bu ndi-mọ-ozi nke nzukọ Kraist asa ahu: ihe-idọba-oriọna asa ahu bu kwa nzukọ Kraist asa.