7 Agha we puta n'elu-igwe: Maikael na ndi-mọ-ozi-ya buru agha megide dragon ahu; dragon ahu na ndi-mọ-ozi-ya we bue agha;
8 ha enweghi kwa ike, ahughi kwa ọnọdu-ha ọzọ n'elu-igwe.
9 Ewe chudà dragon uku ahu, bú agwọ ochie ahu, onye anākpọ Ekwensu na Setan, onye nēduhie uwa nile madu bi; achudara ya n'uwa, chudà kwa ndi-mọ-ozi-ya, ha na ya.
10 M'we nu oké olu ka ọ nādà n'elu-igwe, si, Ub͕u a ka ọ biaworo, bú nzọputa ahu, na ike ahu, na ala-eze Chineke-ayi, na ichi-isi nke Kraist-Ya: n'ihi na achudara onye ahu nke nēbo umu-nna-ayi ebubo, onye nēbo ha ebubo n'iru Chineke-ayi ehihie na abali.
11 Ndi ahu we merie ya n'ihi ọbara Nwa-aturu ahu, na n'ihi okwu àmà-ha; ha ahughi kwa ndu-ha n'anya rue ọnwu.
12 N'ihi nka, ka obi nātọ unu utọ, unu elu-igwe nile, na unu ndi bi nime ha. Ahuhu gādiri uwa na oké osimiri: n'ihi na ekwensu aridakuruwo unu, nēnwe oké ọnuma, ebe ọ matara na o nwere nání nwa oge.
13 Mb͕e dragon ahu huru na achudara ya-ri n'uwa, o we sob͕ue nwanyi ahu, bú nwanyi nke muputara Nwa-nwoke ahu.