3 ha we nābù dika agāsi na ọ bu abù ọhu n'iru oche-eze ahu, na n'iru ihe anọ ahu nke di ndu na ndi-okenye ahu: ọ dighi kwa onye ọ bula puru imuta abù ahu ma-ọbughi ọgu nnù iri na ọgu nnù asatọ ahu, bú ndi ab͕atarari n'uwa.
4 Ndia bu ndi nēmerughi onwe-ha n'aru ndinyom; n'ihi na ha di ọcha ka umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. Ndia bu ndi nēso Nwa-aturu ahu ebe ọ bula Ọ nēje. Ndia ka ab͕atara n'etiti madu, iburu Chineke na Nwa-aturu ahu nkpuru mbu.
5 Ọ dighi kwa ugha ọ bula ahuru n'ọnu-ha: ha bu ndi anātaghi uta.
6 M'we hu mọ-ozi ọzọ ka ọ nēfe n'etiti elu-igwe, nēnwe ozi ọma ebighi-ebi izisara ndi nānọdu n'elu uwa, bú mba nile ọ bula na ebo nile ọ bula na asusu nile ọ bula na ndi nile ọ bula;
7 ọ nēwere kwa oké olu si, Tuanu egwu Chineke, nye kwa Ya otuto; n'ihi na oge hour nke ikpé-Ya abiawo: kpọ-kwa-nu isi ala nye Ya, bú Onye kère elu-igwe na ala, oké osimiri na isi-iyi nile nke miri nile.
8 Mọ-ozi ọzọ, bú nke-abua, we so, si, Ọ dawo, ọ dawo, bú Babilon uku ahu, nke meworo ka mba nile ṅua nime manya nke ọnuma nke ikwa-iko-ya.
9 Mọ-ozi ọzọ, bú nke-atọ, we so ha, were oké olu si, Ọ buru na onye ọ bula nākpọ isi ala nye anu-ọhia ahu na ihe-oyiyi-ya, nānata kwa akàrà-ya n'egedege-iru-ya, ma-ọbu n'aka-ya,