6 Nyeghachinu ya ọbuná dika ya onye-ya nyeghachiri madu, nye-kwa-nu ya okpukpu abua dika ọlu-ya nile di: nime iko ahu ọ kwara akwa, kwaranu ya okpukpu abua.
7 Ka ha ra, bú otuto o nyere onwe-ya, na inupu-isi ọ nupuru, nyenu ya nmekpa-aru na iru-újú ra otú ahu: n'ihi na ọ nāsi n'obi-ya, Anamanọdu dika eze-nwanyi, abughikwa m nwanyi di-ya nwuru, ọ dighi kwa iru-újú m'gāhu ma-ọli.
8 N'ihi nka ọ bu n'otù ubọchi ka ihe-otiti-ya nile gābia, bú ọnwu, na iru-újú, na unwu; agērechapu kwa ya n'ọku; n'ihi na Ọ di ike, bú Onye-nwe-ayi Chineke, Onye kpere ya ikpé.
9 Ndi-eze uwa, ndi soro ya kwa iko nupu kwa isi, ha gākwa-kwa-ra ya ákwá, ti-kwa-ra ya aka n'obi, mb͕e ha gēle anwuru-ọku nke orire-ọku-ya anya,
10 ka ha nēguzo n'ebe di anya n'ihi egwu nke nmekpa-aru-ya, nāsi, Ahuhu, ahuhu, obodo uku ahu, Babilon, bú obodo ahu di ike! n'ihi na n'otù oge hour ka ikpé-gi biara.
11 Ndi-ahia nke uwa nākwa-kwa-ra ya ákwá, nēru-kwa-ra ya újú, n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nāzu ihe-ahia-ha ọzọ, bú nke ha nēweta n'ub͕ọ-ha;
12 ihe-ahia ọla-edo, na ọla-ọcha, na nkume di oké ọnu-ahia, na pearl, na ezi ákwà ọcha, na ákwà ododo, na nkisi, na ákwà uhie; na osisi nile ọ bula nēsì ísì utọ, na ihe nile ọ bula eji ọdu me, na ihe nile ọ bula eji osisi dikarisiri oké ọnu-ahia, ma-ọbu ọla, ma-ọbu ígwè, ma-ọbu marble, me;