25 Otú ọ di, ihe unu nwere, jidesienu ya ike rue mb͕e M'gābia.
26 Onye nēmeri emeri, na onye nēdebe ọlum nile rue ọgwugwu ihe nile, ya ka M'gēnye kwa ike ichi mba nile:
27 ọ gewere kwa nkpa-n'aka ígwè zùa ha dika aturu, dika anākujisi ite nke ọkpu-ite; dika Mu onwem natawokwara n'aka Nnam:
28 M'gēnye kwa ya kpakpando ututu.
29 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist.