12 o nwe-kwa-ra oké mb͕idi di elu; nwe kwa ọnu-uzọ-ama iri na abua, nwe kwa ndi-mọ-ozi iri na abua n'ọnu-uzọ-ama ahu; nwe kwa aha edekwasiworo ha, nke bu aha nke ebo iri na abua nke umu Israel:
13 n'akuku Ọwuwa-anyanwu ọnu-uzọ-ama atọ di; n'akuku Ugwu ọnu-uzọ-ama atọ di kwa; n'akuku Ndida ọnu-uzọ-ama atọ di kwa; n'akuku Ọdida-anyanwu ọnu-uzọ-ama atọ di kwa.
14 Mb͕idi obodo ahu nwe-kwa-ra ntọ-ala iri na ab͕ua, n'elu ha ka edereri aha iri na abua nke ndi-ozi iri na abua ahu nke Nwa-aturu ahu.
15 Onye ahu nke nākpayerem uka nwe-kwa-ra ihe-ọtùtù, bú amì nke ọla-edo, ka o we tùa obodo ahu, na ọnu-uzọ-ama-ya nile, na mb͕idi-ya.
16 Obodo ahu nwe-kwa-ra nkuku anọ ra nrata, ogologo-ya ra kwa ka obodobo-ya: o we were amì ahu tùa obodo ahu, orú nnù furlong na nnù iri: ogologo-ya na obodobo-ya na elu-ya ra.
17 O we tù mb͕idi-ya, ọgu cubit asa na anọ, dika ọtùtù madu si di, ya bu, nke mọ-ozi.
18 Ihe eji lu mb͕idi ahu bu jasper: obodo ahu bu kwa ọla-edo anuchara anucha, dika enyo nēnwu enwu.