23 Anyanwu ma-ọbu ọnwa adighi kwa obodo ahu nkpà, ka ha mukwasi ya: n'ihi na ebube Chineke nyere ya ìhè, oriọna-ya bu kwa Nwa-aturu ahu.
24 Mba nile gēwere kwa ìhè-ya jegharia: ndi-eze nke uwa nēwebata kwa ebube-ha nime ya.
25 Agaghi-emechi kwa ọnu-uzọ-ama-ya n'ehihie ma-ọli (n'ihi na abali agaghi-adi n'ebe ahu):
26 ha gēwebata kwa ebube na nsọpuru nke mba nile nime ya:
27 ọ dighi kwa ihe ọ bula emeruru emeru, ma-ọbu onye nēme ihe-árú na ugha, gābà nime ya ma-ọli: kama ọ bu nání ndi edeworo aha-ha n'akwukwọ nke ndu Nwa-aturu ahu.