8 Mu onwem Jọn bu kwa onye nānu nāhu kwa ihe ndia. Mb͕e m'nuru, hu kwa, m'we da n'ala ikpọ isi ala n'iru ukwu mọ-ozi ahu onye nēgosim ihe ndia.
9 O we sim, Lezi anya ka i ghara ime ya: abum orù-ibe-gi, buru kwa orù-ibe nke umu-nna-gi, bú ndi-amuma, ha na ndi nēdebe okwu nile nke akwukwọ a: kpọ isi ala nye Chineke.
10 O we sim, Akala okwu nile nke amuma nke akwukwọ a akàrà; n'ihi na oge ahu di nso.
11 Onye nēme ajọ omume, ya me ajọ omume ga n'iru: onye ru-kwa-ra inyi, ka eme ka o ru inyi ga n'iru: onye ezi omume, ya me ezi omume ga n'iru: onye di kwa nsọ, ka edo ya nsọ ga n'iru.
12 Le, anamabia ọsọsọ; ugwọ-ọlum di kwa n'akam, inyeghachi onye ọ bula dika ọlu-ya si di.
13 Mu onwem bu Alfa ahu na Omega ahu, onye mbu na onye ikpe-azu, nmalite na ọgwugwu.
14 Ngọzi nādiri ndi nāsa uwe-nwuda-ha, ka ha we nwe ike n'ebe osisi nke ndu ahu di, si kwa n'ọnu-uzọ-ama ahu ba nime obodo ahu.