1 Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu, ma le, ọnu-uzọ ka o gheworo oghe n'elu-igwe, olu mbu m'nu-kwa-ra, olu dika nke opì nākpayerem uka, otù onye nāsi, Rigota n'ebe a, M'gēgosi kwa gi ihe nile nke nāghaghi iputa mb͕e ihe ndia gasiri.
2 Ngwa ngwa emerem ka m'nọ nime Mọ Nsọ: ma le, edebere oche-eze n'elu-igwe, otù Onye nānọkwasi kwa n'oche-eze ahu;
3 Onye ahu Nke nānọdu ala yiri nkume jasper na sardius ma ọ buru na anēle Ya anya: eke-na-ogwurugwu di kwa oche-eze ahu gburugburu, yiri emerald ma ọ buru na anēle ya anya.
4 Orú oche-eze na anọ di kwa oche-eze ahu gburugburu: m'we hu orú ndi-okenye na anọ ka ha nānọkwasi n'oche-eze ndia, ndi eb͕okwasiworo uwe ọcha; ahu-kwa-ram okpu-eze nke ọla-edo n'isi-ha.
5 Àmùmà na olu na éb͕è-elu-igwe nēsi kwa n'oche-eze ahu puta. Ọwa nke ọku asa nēnwu n'iru oche-eze ahu, nke bu Mọ asa ahu nke Chineke;