2 Ngwa ngwa emerem ka m'nọ nime Mọ Nsọ: ma le, edebere oche-eze n'elu-igwe, otù Onye nānọkwasi kwa n'oche-eze ahu;
3 Onye ahu Nke nānọdu ala yiri nkume jasper na sardius ma ọ buru na anēle Ya anya: eke-na-ogwurugwu di kwa oche-eze ahu gburugburu, yiri emerald ma ọ buru na anēle ya anya.
4 Orú oche-eze na anọ di kwa oche-eze ahu gburugburu: m'we hu orú ndi-okenye na anọ ka ha nānọkwasi n'oche-eze ndia, ndi eb͕okwasiworo uwe ọcha; ahu-kwa-ram okpu-eze nke ọla-edo n'isi-ha.
5 Àmùmà na olu na éb͕è-elu-igwe nēsi kwa n'oche-eze ahu puta. Ọwa nke ọku asa nēnwu n'iru oche-eze ahu, nke bu Mọ asa ahu nke Chineke;
6 ihe di kwa n'iru oche-eze ahu dika oké osimiri eji enyo me yiri crystal; ihe anọ nke di ndu nọ kwa n'etiti oche-eze ahu, nọ kwa oche-eze ahu gburugburu, ndi juputara n'anya anya n'iru na azu.
7 Ihe mbu ahu nke di ndu yiri ọdum, ihe nke-abua ahu nke di ndu yi-kwa-ra nwa-ehi, ihe nke-atọ ahu nke di ndu nwe-kwa-ra iru dika nke madu, ihe nke-anọ ahu nke di ndu yi-kwa-ra ugo nēfe efe.
8 Ihe anọ ahu nke di ndu nwe-kwa-ra nkù isi n'otù n'otù, ha juputa-kwa-ra n'anya anya gburugburu, ya na nime: ha adighi-ezu ike ehihie na abali, nāsi, Nsọ, nsọ, nsọ, ka Onye ahu di, bú Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, Onye diri, Onye nādi kwa adi, Onye nābia kwa.