1 M'we hu akwukwọ nke edere ya-ri ihe n'ime na azu, nke eji-kwa-rari akàrà asa kasie ya ike, ka ọ di n'aka-nri Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu.
2 M'we hu mọ-ozi di ike, ka o nēwere oké olu nēkwusa, si, Ònye kwesiri isaghe akwukwọ ahu, na inyawapu akàrà-ya?
3 Ọ dighi kwa onye ọ bula di n'elu-igwe, ma-ọbu n'elu uwa, ma-ọbu n'okpuru uwa, puru isaghe akwukwọ ahu, ma-ọbu ile ya anya.
4 M'we kwa ákwá nke-uku, n'ihi na ahughi onye ọ bula kwesiri isaghe akwukwọ ahu, ma-ọbu ile ya anya:
5 otù onye n'etiti ndi-okenye ahu we sim, Akwala ákwá: le, Ọdum ahu Nke si n'ebo Juda puta, Onye bu Nkpọrọgwu nke Devid, O kwesiri, isaghe akwukwọ ahu na akàrà-ya asa.