14 Ewe kewapu elu-igwe dika akwukwọ-odide mb͕e anāpiakọta ya; ewe wepu ugwu nile na agwe-etiti nile ọ bula n'ọnọdu-ha.
15 Ndi-eze nke uwa, na ndi-amadi, na ndi-isi-ọchi-agha, na ndi-ọgaranya, na ndi di ike, na orù ọ bula, na onye ọ bula nwere onwe-ya, we zobe onwe-ha nime ọb͕à na nime oké nkume nke ugwu:
16 ha nāsi kwa ugwu na oké nkume ahu, Dakwasinu ayi, zopu ayi n'iru Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu, zopu kwa ayi n'iwe nke Nwa-aturu ahu:
17 n'ihi na oké ubọchi nke iwe-ha abiawo; ònye pu-kwa-ra iguzo?