4 Inyinya ọzọ we puta, bú inyinya nke nācha ọku ọku: ewe nye onye nānọkwasi ya ike inapu udo n'uwa, ya na ka ha we b͕urita onwe-ha: ewe nye ya oké mma-agha.
5 Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-atọ, m'we nu ihe nke-atọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, Bia. M'we hu, ma le, inyinya oji; onye nānọkwasi ya nwe-kwa-ra ihe-ọtùtù n'aka-ya.
6 M'we nu dika agāsi na ọ bu otu n'etiti ihe anọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, Otù ọtùtù ntà nke ọkà bu otù shilling, ọtùtù ntà atọ nke barley bu otù shilling; emejọ-kwa-la manu na manya-vine.
7 Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-anọ, m'we nu olu nke ihe nke-anọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, Bia.
8 M'we hu, ma le, inyinya nke aru-ya yiri ozu: onye nānọkwasi kwa ya, aha-ya bu Ọnwu; Hedis we so ya ga. Ewe nye ha ike ichi otù uzọ n'uzọ anọ nke uwa, iji mma-agha, na iji oké unwu, na iji ọnwu, nēb͕u, iwere kwa anu-ọhia nke uwa nēb͕u.
9 Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-ise, m'we hu n'okpuru ebe-ichu-àjà ahu nkpuru-obi nke ndi eb͕ururi n'ihi okwu Chineke, na n'ihi àmà ahu nke ha nwere:
10 ha we were oké olu tie nkpu, si, Rùe ole mb͕e, Onye-nwe-ayi, Onye di nsọ, buru kwa Onye-ezi-okwu, ka I nēkpeghi ikpé bọ̀ kwa ọ́bọ̀ ọbara-ayi n'isi ndi bi n'elu uwa?