37 akukọ ahu unu onwe-unu matara, nke putara ìhè na Judia dum, nāmalite site na Galili, mb͕e baptism nke Jọn kwusara gasiri;
38 bú Jisus Nke si na Nazaret puta, otú Chineke were Mọ Nsọ na ike te Ya dika manu-otite: Onye jeghariri nālu ọlu ọma, nēme kwa ka aru di ha ike, bú ndi nile ekwensu mere ha dika onye-nwe-ha; n'ihi na Chineke soro Ya.
39 Ayi onwe-ayi bu kwa ndi-àmà nke ihe nile O mere n'ala ndi-Ju, na nime Jerusalem; Onye ha b͕u-kwa-ra, nākwuba Ya n'elu osisi.
40 Onye ahu ka Chineke mere ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ, O were kwa Ya nye ka egosi Ya n'ìhè.
41 Ọ bughi ndi-Ju nile ka egosiri Ya, kama ọ bu ndi-àmà Chineke buru uzọ rọputa, bú ayi onwe-ayi, ndi soro Ya nēri nāṅu kwa mb͕e O siri na ndi nwuru anwu bilie.
42 O we nye ayi iwu ka ayi kwusara ndi-Ju, ka ayi kwusi kwa ike na Onye a bu Onye Chineke kaworo ibu Onye-ikpé nke ndi di ndu na ndi nwuru anwu.
43 Onye ahu ka ndi-amuma nile nāb͕ara àmà, na site n'aha-Ya onye ọ bula nke kwere na Ya gānata nb͕aghara nmehie.