7 Ma le, mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi guzoro ya nso, ìhè nwu-kwa-ra n'ime-ulo nke ulo-nkpọrọ: o we tie Pita aka n'akuku, kpote ya, si, Bilie ọsọsọ. Nkpọrọ-ya abua we dapu n'aka-ya abua.
8 Mọ-ozi ahu we si ya, Ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi, yiri kwa akpukpọ-ukwu sandal gi. O we me otú ahu. Ọ we si ya, B͕okwasi uwe uku gi n'aru-gi, sọkwam.
9 O we pua, so ya; ma ọ mataghi na ọ bu ezie, bú ihe emere site n'aka mọ-ozi, kama ọ nēchè na ọ nāhu ọhù.
10 Ma mb͕e ha gasiri ndi-nche mbu na ndi-nche nke-abua, ha biaruru ọnu-uzọ-ama ígwè ahu nke esi abà nime obodo; nke meghere onwe-ya nye ha: ha we pua, gabiga n'otù uzọ ntà; ngwa ngwa mọ-ozi ahu we pua n'ebe ọ nọ.
11 Mb͕e Pita mara onwe-ya, ọ si, Ub͕u a ka m'matara n'ezie, na Onye-nwe-ayi ziputara mọ-ozi-Ya, weputam n'aka Herod, ya na ile-anya nile nke ndi-Ju.
12 Mb͕e ọ ghọtasiri ihe ahu, ọ bia rue ulo Meri nne Jọn onye akpọ-kwa-ra Mark; ebe ọtutu madu zukọrọri nēkpe kwa ekpere.
13 Ma mb͕e ọ kuru aka n'ọnu-uzọ nke ọnu-uzọ-ama, otù nwa-ab͕ọghọ, aha-ya bu Roda, biara iṅa nti.