14 Ma ha onwe-ha sitere na Paga gabiga, bia rue Antiọk di na Pisidia; ha we ba nime ulo-nzukọ-ha n'ubọchi-izu-ike, we nọdu ala.
15 Ma mb͕e agusiri akwukwọ iwu na ndi-amuma, ndi-isi ulo-nzukọ ahu zigara ha ozi, si, Umu-nne-ayi, ọ buru na unu nwere okwu nkasi-obi igwa ndi-ayi, kwuenu.
16 Pọl we bilie, kpukpu kwa aka, si,Ndikom nke Israel, na ndi nātu egwu Chineke, nurunu.
17 Chineke nke ndi nka, bú Israel, rọputara nna-ayi-hà, we welie ndi Israel elu mb͕e ha nọ dika ọbìa n'ala Ijipt, O were kwa ogwe-aka di elu duputa ha nime ya.
18 Oge ra ka ọgu arọ abua O we nānagide omume-ha n'ọhia.
19 Mb͕e O wedasiri mba asa n'ala Kenean, O me ka ha keta ala-ha, ihe ra ka nnù arọ na ọgu arọ abua na iri:
20 mb͕e ihe ndia gasiri O nye ha ndi-ikpé rue oge Samuel, bú onye-amuma.