35 N'ihi na Ọ nāsi kwa n'abù ọma di iche, I gaghi-enye Onye nke Gi di ọcha n'obi ka Ọ hu ire-uré.
36 N'ihi na Devid, mb͕e o jesiri ọb͕ọ-ya ozi, o sitere n'ìzù Chineke da n'ura ọnwu, ewe tọb͕ọ ya n'ebe nna-ya-hà nọ, o we hu ire-uré:
37 ma Onye ahu Chineke mere ka O bilie ahughi ire-uré.
38 Ya mere maranu nka, umu-nnem, na anēsite n'ọnu Onye a kwusa nb͕aghara nmehie nile nye unu:
39 ọ bu kwa nime Onye a ka anāgu onye ọ bula nke kwere na Ya n'onye ezi omume n'ihe nile, nke anāpughi igu unu na ndi ezi omume na ha nime iwu Moses.
40 Ya mere lezienu anya, ka ihe ahu ghara ibiakwasi unu, nke ekwuworo n'akwukwọ ndi-amuma, si,
41 Lenu, ndi-nlelì-anya, ka o ju kwa unu anya, ka ekpochapu kwa unu;N'ihi na ọlu ka Mu Onwem nālu n'ubọchi-unu,Ọlu unu nāgaghi-ekwe ma-ọli ọ buru na onye ọ bula kọrọ unu akukọ-ya.