36 Onye-nche ulo-nkpọrọ ahu we kọrọ Pọl okwu ndia, si, Ndi-ikpé ezitewo ka arapu unu la: ya mere putanu ub͕u a, la kwa n'udo.
37 Ma Pọl siri ha, Ha piara ayi ihe n'iru ọra madu, nāmaghi ayi ikpé, ọ bu ezie na ayi bu ndi Rom, ha we tubà ayi n'ulo-nkpọrọ; hà nāchupu kwa ayi ub͕u a na nzuzo? ha agaghi-eme ya ma-ọli; kama ka ha onwe-ha bia duputa ayi.
38 Ndi-ọchi-utari ahu we kọrọ ndi-ikpé okwu ndia: ha we tua egwu, mb͕e ha nuru na ha bu ndi Rom;
39 ha we bia riọ ha; mb͕e ha duputasiri ha, ha we kpere ha ka ha si n'obodo-ha pua.
40 Ha we si n'ulo-nkpọrọ-ahu puta, ba n'ulo Lidia: mb͕e ha husiri umu-nna nime Kraist, ha kasie ha obi, we pua.