12 Mb͕e chi-ya bọrọ, ndi-Ju ufọdu we kekọta onwe-ha n'otù, me kwa onwe-ha ka ha buru anathema, si na ha agaghi-eri ihe ma-ọbu iṅu ihe rue mb͕e ha gēb͕uwori Pọl.
13 Ndi ṅukọrọ iyi a kariri ọgu ndikom abua.
14 Ndi ahu we biakute ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye, si, Ayi ji anathema me onwe-ayi ka ayi buru anathema, na ayi agaghi-edetu ihe ọ bula ọnu rue mb͕e ayi gēb͕uwori Pọl.
15 Ya mere ub͕u a unu onwe-unu na nnọkọ-ikpé-ayi gosi onye-isi-ọchi-agha ka o kuda ya biakute unu, dika unu gaje itule ihe bayere ya nke-ọma kari: ma ayi onwe-ayi bu ndi edoziworo ib͕u ya mb͕e ọ kābiarughi unu nso.
16 Ma nwa nke nwa-nne-nwanyi Pọl nuru na ha nēche inwude ya, o we bia ba n'ulo ndi-agha ahu, kọrọ Pọl.
17 Pọl we kpọtara onwe-ya otù onye nime ndi-ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, si, Duru nwa-okorọbia nka jekuru onye-isi-ọchi-agha: n'ihi na o nwere ihe ikọrọ ya.
18 Ya mere o kuru ya, duru ya jekuru onye-isi-ọchi-agha, si, Pọl onye-nkpọrọ kpọrọm jekuru ya, we kperem ka m'dutara gi okorọbia nka, ebe ọ nwere okwu igwa gi.