1 Mb͕e ekpebìri na ayi gābà n'ub͕ọ je Itali, ha we rara Pọl na ufọdu ndi-nkpọrọ ọzọ nye n'aka ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, aha-ya bu Juliọs, nke òtù ndi-agha Ọgustọs.
2 Ayi we ba n'ub͕ọ Adramitiọm, nke gaje iga ebe di n'usọ oké osimiri nke Esia, we nupu, Aristakọs, onye Masedọnia nke Tesalọnaika, soro kwa ayi.
3 Ubọchi soni ayi we rue ala na Saidon: Juliọs we were obi-ọma mezie Pọl, kwere ka o jekuru ndi-eyì-ya ka ewe le ya anya nke-ọma.
4 Ayi we si n'ebe ahu nupu ub͕ọ, we nāga ala Saiprọs nso, n'ihi na ifufe nēfegide ayi.
5 Mb͕e ayi gabigasiri oké osimiri nke di n'akuku Silisia na Pamfilia, ayi we rue Maira, obodo nke Lisia.